Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 26:25-33 Bible Nso (IGBOB)

25. Ndia bu ab͕uru Isaka, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ asatọ, na ọgu iri-na-ise.

26. Umu-ndikom Zebulun, dika ab͕uru nile ha si di: nke Sered bu ab͕uru ndi Sered: nke Ilon bu ab͕uru ndi Ilon: nke Jahleel bu ab͕uru ndi Jahleel.

27. Ndia bu ab͕uru ndi Zebulun, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ asa, na nnù iri-na-otù, na ọgu ise.

28. Umu-ndikom Josef, dika ab͕uru nile ha si di: Manase na Efraim.

29. Umu-ndikom Manase: nke Makia bu ab͕uru ndi Makia: Makia we muta Gilead: nke Gilead bu ab͕uru ndi Gilead.

30. Ndia bu umu-ndikom Gilead: nke Ieza bu ab͕uru ndi Ieza: nke Hilek bu ab͕uru ndi Hilek.

31. nke Asriel bu ab͕uru ndi Asriel: nke Shekem bu ab͕uru ndi Shekem:

32. nke Shemida bu ab͕uru ndi Shemida: nke Hefa bu ab͕uru ndi Hefa.

33. Ma Zelọfehad nwa Hefa enweghi umu-ndikom, ma ọ nwere umu-ndinyom: aha umu-ndinyom Zelọfehad bu Mahla, na Noa, na Họgla, na Milka, na Tiaza.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 26