Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 26:17-31 Bible Nso (IGBOB)

17. nke Arod bu ab͕uru ndi Arod: nke Areli bu ab͕uru ndi Areli.

18. Ndia bu ab͕uru umu-ndikom Gad, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ ise, na nnu, na ọgu ise.

19. Umu-ndikom Juda, Ia na Onan: ma Ia na Onan nwuru n'ala Kenean.

20. Umu-ndikom Juda, dika ab͕uru nile ha si di, bu; nke Shila bu ab͕uru ndi Shila: nke Perez bu ab͕uru ndi Perez: nke Zera bu ab͕uru ndi Zera.

21. Umu-ndikom Perez bu kwa; nke Hezron bu ab͕uru ndi Hezron: nke Hamul bu ab͕uru ndi Hamul.

22. Ndia bu ab͕uru Juda, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ iteghete, na nnù iri-na-otù, na ọgu ise.

23. Umu-ndikom Isaka, dika ab͕uru nile ha si di: nke Tola bu ab͕uru ndi Tola: nke Puva bu ab͕uru ndi-Punait:

24. nke Jashub bu ab͕uru ndi Jashub: nke Shimron bu ab͕uru ndi Shimron.

25. Ndia bu ab͕uru Isaka, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ asatọ, na ọgu iri-na-ise.

26. Umu-ndikom Zebulun, dika ab͕uru nile ha si di: nke Sered bu ab͕uru ndi Sered: nke Ilon bu ab͕uru ndi Ilon: nke Jahleel bu ab͕uru ndi Jahleel.

27. Ndia bu ab͕uru ndi Zebulun, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ asa, na nnù iri-na-otù, na ọgu ise.

28. Umu-ndikom Josef, dika ab͕uru nile ha si di: Manase na Efraim.

29. Umu-ndikom Manase: nke Makia bu ab͕uru ndi Makia: Makia we muta Gilead: nke Gilead bu ab͕uru ndi Gilead.

30. Ndia bu umu-ndikom Gilead: nke Ieza bu ab͕uru ndi Ieza: nke Hilek bu ab͕uru ndi Hilek.

31. nke Asriel bu ab͕uru ndi Asriel: nke Shekem bu ab͕uru ndi Shekem:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 26