Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 26:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, mb͕e ihe-otiti ahu gasiri, na Jehova gwara Moses na Eleeza nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, okwu, si,

2. Gutanu ọnu-ọgugu nzukọ nile nke umu Israel, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, onye ọ bula nke nāpukuru usu-ndi-agha n'Israel.

3. Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we kpayere ha uka n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko, si,

4. Gutanu ọnu-ọgugu ndi Israel, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru; dika Jehova nyere Moses na umu Israel iwu, bú ndi nēsi n'ala Ijipt puta.

5. Reuben, bú ọkpara Israel: umu-ndikom Reuben; nke Hanok bu ab͕uru ndi Hanok: nke Palu bu ab͕uru ndi Palu:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 26