Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 26:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, mb͕e ihe-otiti ahu gasiri, na Jehova gwara Moses na Eleeza nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, okwu, si,

2. Gutanu ọnu-ọgugu nzukọ nile nke umu Israel, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, onye ọ bula nke nāpukuru usu-ndi-agha n'Israel.

3. Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we kpayere ha uka n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko, si,

4. Gutanu ọnu-ọgugu ndi Israel, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru; dika Jehova nyere Moses na umu Israel iwu, bú ndi nēsi n'ala Ijipt puta.

5. Reuben, bú ọkpara Israel: umu-ndikom Reuben; nke Hanok bu ab͕uru ndi Hanok: nke Palu bu ab͕uru ndi Palu:

6. nke Hezron bu ab͕uru ndi Hezron: nke Kami bu ab͕uru ndi Kami.

7. Ndia bu ab͕uru ndi Reuben: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ ise, na nnù iteghete, na ọgu isi, na iri.

8. Umu ndikom Palu kwa; Eliab.

9. Umu-ndikom Eliab; Nemuel, na Detan, na Abairam. Ndia bu Detan ahu na Abairam ahu, ndi akpọrọ nke nzukọ Israel, ndi lusoro Moses, luso kwa Eron, ọ̀gù nime nzukọ Kora, mb͕e ha lusoro Jehova ọ̀gù:

10. ala we saghe ọnu-ya, loda ha na Kora, mb͕e nzukọ ahu nwuru; mb͕e ọku ahu ripiara ọgu ndikom iri-na-abua na iri ahu, ha we ghọ ihe-iriba-ama.

11. Ma umu-ndikom Kora anwughi.

12. Umu-ndikom Simeon, dika agburu nile ha si di: nke Nemuel bu ab͕uru ndi Nemuel: nke Jamin bu ab͕uru ndi Jamin: nke Jakin bu ab͕uru ndi Jakin:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 26