Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 25:9-18 Bible Nso (IGBOB)

9. Ma ndi nwuru n'ihe-otiti ahu di orú nnù uzọ atọ.

10. Jehova we gwa Moses okwu, si,

11. Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, emewo ka ọnumam si n'aru umu Israel laghachi, n'iwere ekworom kwo ekworo n'etiti ha, M'we ghara ime ka umu Israel gwusia n'ekworom.

12. N'ihi ya si ya, Le, anamenye ya ọb͕ub͕a-ndum nke udo:

13. ọ gāburu ya, buru kwa nkpuru-ya gānọchi ya, ọb͕ub͕a-ndu ọlu-nchu-àjà ebighi-ebi; n'ihi na o kworo ekworo bayere Chineke-ya, kpuchi-kwa-ra umu Israel nmehie-ha.

14. Ma aha nwoke Israel ahu nke etib͕uru etib͕u, onye etib͕uru ya na nwayi Midian, bu Zimri, nwa Salu, bú onye-isi nke otú ulo nna nke ndi Simeon.

15. Aha nwayi Midian ahu nke etib͕uru etib͕u bu Kọzbi, nwa Zua; onye-isi mba nke otù ulo nna na Midian ka ọ bu.

16. Jehova we gwa Moses okwu, si,

17. Kpab͕ue ndi Midian, tib͕u kwa ha:

18. n'ihi na ha nākpab͕u unu n'aghughọ nile ha, nke ha ji ghọb͕u unu n'okwu Peoa, na n'okwu kọzbi, bú nwa-nwayi onye-isi Midian, nwa-nne-ha nwayi, nke etib͕uru n'ubọchi ihe-otiti ahu n'okwu Peoa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 25