Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 25:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Israel we biri na Shitim, ndi Israel we malite isoro umu-ndinyom Moab nākwa iko:

2. ndinyom ahu we kpọ ndi Israel ibia n'àjà chi nile ha; ndi Israel we rie ihe, kpọ isi ala nye chi nile ha.

3. Israel we kekọta onwe-ya n'aru Beal-peoa: iwe Jehova we di ọku megide Israel.

4. Jehova we si Moses, Chiri ndi-isi nile nke ndim, kpọgidere ha Jehova n'iru anyanwu, ka idi-ọku nke iwe Jehova we si n'aru Israel laghachi.

5. Moses we si ndi-ikpé Israel, B͕uenu, onye ọ bula ya b͕ue ndikom-ya ndi nēkekọta onwe-ha n'aru Beal-peoa.

6. Ma, le, otù nwoke nime umu Israel biara, weta nso umu-nne-ya otù nwayi Midian n'anya Moses, na n'anya nzukọ nile nke umu Israel, mb͕e ha onwe ha nākwa ákwá n'ọnu-uzọ ulo-kwū nzute.

7. Finehas, nwa-nwoke Eleeza, nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, we hu ya, o we si n'etiti nzukọ Israel bilie, were ube n'aka-ya,

8. soro nwoke Israel ahu ba nime ulo-ndina-ya, mapue ha abua, bú nwoke Israel ahu, na nwayi ahu rue ime-afọ-ya. Ewe b͕ochie ihe otiti ahu n'aru umu Israel.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 25