Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 22:9-22 Bible Nso (IGBOB)

9. Chineke we biakute Belam, si, Òle ndi bu ndikom ndia nọyere gi?

10. Belam we si Chineke, Belak nwa Zipoa, bú eze Moab, eziteworom ozi, si,

11. Le, ndi ahu nke si n'Ijipt puta, ọ nēkpuchi kwa iru ala: ub͕u a, bia kọcharam ha; eleghi anya m'gēnwe ike ibuso ha agha, m'gāchupu kwa ha.

12. Chineke we si Belam, Esola ha je; abula ndi Israel ọnu; n'ihi na ndi agọziri agọzi ka ha bu.

13. Belam we bilie n'ututu, si ndi-isi Belak, Lanu n'ala-unu: n'ihi na Jehova n'aju ikwe ka m'soro unu je.

14. Ndi-isi Moab we bilie, biakute Belak, si, Belam nāju isoro ayi bia.

15. Belak we ziga kwa ndi-isi ọzọ, di ọtutu, di kwa nsọpuru, kari ndi ahu.

16. Ha we biakute Belam, si ya, Otú a ka Belak nwa Zipoa siri, Biko, ekwela ka ihe b͕ochie gi ibiakutem:

17. n'ihi na m'ghaghi isọpuru gi nke-uku, ọ bu kwa ihe ọ bula i gāsim ka m'gēme: ma, biko, bia, kọcharam ndi nka.

18. Belam we za, si ndi-orù Belak, Ọ buru na Belak enyewo m ojuju ulo-ya nke ọla-ọcha na ọla-edo, apughm igabiga okwu-ọnu nke Jehova, bú Chinekem, ime ihe ntà ma-ọbu ihe uku.

19. Ma ub͕u a, biko, nọdunu n'ebe a, ọbuná unu onwe-unu, abali a, ka m'we mara uka Jehova gākpayere m ọzọ.

20. Chineke we biakute Belam n'abali, si ya, Ọ buru na ọ bu ikpọ gi ka ndikom ahu biara, gi bilie, soro ha je; ma nání okwu nke M'nāgwa gi, nke ahu ka i gēme.

21. Belam we bilie n'ututu, jikwa nne-inyinya-ibu-ya soro ndi-isi Moab je.

22. Iwe Chineke we di ọku n'ihi na ọ nēje: mọ-ozi nke Jehova we guzo onwe-ya n'uzọ ibu onye nēmegide ya. Ma ya onwe-ya nānọkwasi na nne-inyinya-ibu-ya, umu-okorọbia-ya abua so kwa ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 22