Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 22:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Umu Israel we bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ala ihe nādighi nke Moab n'ofè Jọdan na nso Jeriko.

2. Belak nwa Zipoa we hu ihe nile Israel mereri ndi-Amorait.

3. Moab we tua ujọ ndi Israel nke-uku, n'ihi na ọtutu ka ha di; ike gwusia Moab n'iru umu Israel.

4. Moab we si ndi-okenye Midian, Ub͕u a nkpọkọta nka gārachapu ihe nile nke di ayi buruburu, dika ehi nārachapu akwukwọ ndu nke ọhia. Belak nwa Zipoa bu kwa eze Moab na mb͕e ahu.

5. Ọ we zigara Belam nwa Beoa ndi-ozi, rue Petoa, nke di n'akuku Osimiri, bú ala nke umu ndi-ya, ikpọ ya, si, Le, otù ndi esiwo n'Ijipt puta: le, ha ekpuchiwo iru ala, ndi ahu nānọ kwa na ncherita-irum:

6. ma ub͕u a, biko, bia, buaram ndi nka ọnu; n'ihi na ndi di ike ka ọ bu karim: eleghi anya m'gēnwe ike, ka ayi we tib͕ue ha, m'we chupu ha n'ala: n'ihi na amawom na onye i nāgọzi bu onye agọziri agọzi, ma onye i nābu ọnu bu onye anābu ọnu.

7. Ndi-okenye Moab na ndi-okenye Midian we je, ihe nile iji ju ase di kwa n'aka-ha; ha we biakute Belam, gwa ya okwu nile nke Belak.

8. o we si ha, Nọnu ọnọdu-abali n'ebe a n'abali a, m'gēweghachi-kwa-ra unu okwu, dika Jehova si agwam okwu: ndi-isi Moab we nọyere Belam.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 22