30. Ayi ab͕awo ha àkú; Heshbon alawo n'iyì rue Dibon,Ayi emewo ka ọ tọb͕ọrọ n'efu rue Nofa,Nke diruru Medeba.
31. Israel we biri n'ala ndi-Amorait.
32. Moses we ziga iledo Jeza, ha we were umu-obodo-ya nile, napu ndi-Amorait ndi biri n'ebe ahu ala-ha.
33. Ha we chigharia, rigo n'uzọ Bechan: Og, bú eze Beshan, we puta izute ha, ya onwe-ya na ndi-ya nile, ibu agha n'Edrei.
34. Jehova we si Moses, Atula egwu ya; n'ihi na ọ bu n'aka-gi ka M'nyeworo ya, na ndi-ya nile, na ala-ya; i gēme kwa ya dika i mere Saihon, bú eze ndi-Amorait, nke biri nime Heshbon.
35. Ha we tib͕ue ya, na umu-ya ndikom, na ndi-ya nile, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru arapuru ya: ha we nweta ala-ya.