Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 21:24-33 Bible Nso (IGBOB)

24. Israel we were ọnu mma-agha tib͕ue ya, we nweta ala-ya site n'Anon rue Jekob, rue umu Amon: n'ihi na ókè-ala umu Amon siri ike.

25. Israel we were obodo ndia nile: Israel we biri n'obodo nile nke ndi-Amorait, nime Heshbon, na nime umu-obodo-ya nile.

26. N'ihi na Heshbon ahu, obodo Saihon, bú eze ndi-Amorait, ka ọ bu, eze ahu buso-kwa-rari eze gara aga Nke Moab agha, we nara ala-ya nile n'aka-ya, rue Anon.

27. N'ihi ya ndi nātu ilu nāsi,Banu nime Heshbon,Ka ewue obodo Saihon, ka eguzosi kwa ya ike:

28. N'ihi na ọku esiwo na Heshbon pua,Ire-ọku n'obodo Saihon:O ripiawo A nke Moab,Ndi-nwe ebe nile di elu nke Anon.

29. Ahuhu gādiri gi, Moab!I lawo n'iyì, gi ndi Kemosh:Ọ nyewo umu-ya ndikom, dika ndi b͕apuru ab͕apu,Nye kwa umu-ya ndinyom ije na ndọta-n'agha,N'aka Saihon, bú eze ndi-Amorait.

30. Ayi ab͕awo ha àkú; Heshbon alawo n'iyì rue Dibon,Ayi emewo ka ọ tọb͕ọrọ n'efu rue Nofa,Nke diruru Medeba.

31. Israel we biri n'ala ndi-Amorait.

32. Moses we ziga iledo Jeza, ha we were umu-obodo-ya nile, napu ndi-Amorait ndi biri n'ebe ahu ala-ha.

33. Ha we chigharia, rigo n'uzọ Bechan: Og, bú eze Beshan, we puta izute ha, ya onwe-ya na ndi-ya nile, ibu agha n'Edrei.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 21