Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 20:17-28 Bible Nso (IGBOB)

17. biko, ka ayi gabiga nime ala-gi: ayi agaghi-agabiga nime ọhia ma-ọbu nime ubi-vine, ayi agaghi-aṅu kwa miri olùlù: n'uzọ eze ka ayi ganēje, ayi agaghi-ewezuga onwe-ayi n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe, rue mb͕e ayi gāgabiga ókè-ala-gi.

18. Edom we si ya, I gaghi-agabiga nimem, ka m'we ghara iwere mma-agha puta izute gi.

19. Umu Israel we si ya, Ọ bu n'uzọ atuliri atuli ka ayi gārigo: ọ buru kwa na ayi aṅua miri-gi, mu onwem na anu-ulom, m'gēnye kwa gi ọnu-ahia-ya: nání ka m'were ukwum gabiga, ọ dighi ọzọ.

20. O we si, I gaghi-agabiga. Edom we were ndi di uku aka di ike puta izute ya.

21. Edom we ju ikwe ka Israel gabiga n'ókè-ala-ya: Israel we si n'ebe ọ nọ wezuga onwe-ya.

22. Ha we si na Kedesh bulie ije: umu Israel, bú nzukọ ahu nile, we biarue ugwu Hoa.

23. Jehova we gwa Moses na Eron okwu n'ugwu Hoa, n'akuku ókè ala Edom si,

24. Agāchikọta Eron na umu-nna-ya n'ala-mọ' n'ihi na ọ gaghi-abà n'ala ahu nke M'nyeworo umu Israel, n'ihi na unu nupuru isi n'okwu-ọnum na miri Meriba.

25. Chiri Eron na Eleeza nwa-ya, me ka ha rigota n'ugwu Hoa:

26. i gēyipu Eron uwe-ya, yibe ha Eleeza nwa-ya: agāchikọta Eron na umu-nna-ya n'ala-mọ, ọ gānwu kwa n'ebe ahu.

27. Moses we me dika Jehova nyere ya iwu: ha we rigo n'ugwu Hoa n'anya nzukọ Israel nile.

28. Moses we yipu Eron uwe-ya, yibe ha Eleeza nwa-ya; Eron we nwua n'ebe ahu n'elu ugwu ahu: Moses na Eleeza we si n'ugwu ahu ridata.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 20