Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 20:15-23 Bible Nso (IGBOB)

15. na nna-ayi-hà ridara n'Ijipt, ayi we biri n'Ijipt ọtutu ubọchi; ndi Ijipt we mejo ayi, mejọ kwa nna-ayi-hà:

16. ayi we tikue Jehova, O we nu olu-ayi, zite mọ-ozi, me ka ayi si n'Ijipt puta: ma, le ayi onwe-ayi nọ na Kedesh, bú obodo nke di na nsọtu ókè-ala-gi:

17. biko, ka ayi gabiga nime ala-gi: ayi agaghi-agabiga nime ọhia ma-ọbu nime ubi-vine, ayi agaghi-aṅu kwa miri olùlù: n'uzọ eze ka ayi ganēje, ayi agaghi-ewezuga onwe-ayi n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe, rue mb͕e ayi gāgabiga ókè-ala-gi.

18. Edom we si ya, I gaghi-agabiga nimem, ka m'we ghara iwere mma-agha puta izute gi.

19. Umu Israel we si ya, Ọ bu n'uzọ atuliri atuli ka ayi gārigo: ọ buru kwa na ayi aṅua miri-gi, mu onwem na anu-ulom, m'gēnye kwa gi ọnu-ahia-ya: nání ka m'were ukwum gabiga, ọ dighi ọzọ.

20. O we si, I gaghi-agabiga. Edom we were ndi di uku aka di ike puta izute ya.

21. Edom we ju ikwe ka Israel gabiga n'ókè-ala-ya: Israel we si n'ebe ọ nọ wezuga onwe-ya.

22. Ha we si na Kedesh bulie ije: umu Israel, bú nzukọ ahu nile, we biarue ugwu Hoa.

23. Jehova we gwa Moses na Eron okwu n'ugwu Hoa, n'akuku ókè ala Edom si,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 20