onye ahu nke di ọcha gēfesa kwa onye ahu ruru árú n'ubọchi nke-atọ, na n'ubọchi nke-asa: ọ gēwepu kwa nmehie-ya n'ubọchi nke-asa; ọ gāsu kwa uwe-ya, sa kwa aru-ya na miri, di ọcha n'anyasi.