Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 17:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses okwu, si,

2. Gwa umu Israel okwu, nara kwa n'aka-ha nkpa-n'aka nkpa-n'aka, otù diri otù ulo nna, n'aka ndi-isi ha nile, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, nkpa-n'aka iri-na-abua: aha nwoke ọ bula ka i gēdekwasi na nkpa-n'aka-ya

3. Ma aha Eron ka i gēdekwasi na nkpa-n:aka Livai: n'ihi na ọ bu otù nkpa-n'aka ka onye-isi ọ bula nke ulo nke ndi bu nna-ha gēnwe.

4. I gēdo kwa ha n'ulo-ikwū n'iru ihe-àmà ahu, ebe Mu na unu nēzute.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 17