Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 16:7-15 Bible Nso (IGBOB)

7. tiye-kwa-nu ọku nime ha, tukwasi kwa n'elu ha ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Jehova echi: ọ gēru kwa na nwoke ahu nke Jehova gārọputa, onye ahu bu onye nsọ: o zuworo unu, umu Livai.

8. Moses we si Kora, Biko, nurunu, umu Livai:

9. Ọ̀ bu unu ihe ntà na Chineke nke Israel akpawo ókè n'etiti unu na nzukọ Israel, ime ka unu biarue nso Ya; ifè òfùfè nke ebe-obibi Jehova, na iguzo n'iru nzukọ ahu ijere ha ozi;

10. Ọ we me ka i biarue nso, gi na umu-nne-gi niile, bú umu Livai? ùnu nācho kwa ọlu nchu-àjà?

11. N'ihi ya gi onwe-gi na nzukọ-gi nile bu ndi nēzukọ imegide Jehova: ma Eron, gini ka ọ bu na unu nātamu ntamu megide ya?

12. Moses we ziga ikpọ Detan na Abairam, bú umu Eliab: ha we si, Ayi agaghi-arigo:

13. ọ̀ bu ihe ntà na i mewo ka ayi si n'ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya rigoputa, ime ka ayi nwua n'ọzara nka, ma i ghaghi ime kwa onwe-gi onye-isi-ayi?

14. Ọzọ kwa, ọ bughi ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nēru nime ya ka i meworo ka ayi ba, i nyeghi kwa ayi ihe-nketa, bú ubi na ubi-vine: ì gārukpọ anya ndikom ndia? ayi agaghi-arigo.

15. Moses we we iwe di ọku nke-uku, ọ we si Jehova, Echela onyinye-inata-iru-ọma-ha iru: ọ dighi otù inyinya-ibu m'naraworo n'aka-ha, ọ dighi kwa otù onye nime ha M'mejọworo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 16