Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 16:20-32 Bible Nso (IGBOB)

20. Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,

21. Kewapunu onwe-unu n'etiti nzukọ nka, ka M'we me ka ha gwusia dika n'otù ntabi-anya.

22. Ha we da kpue iru-ha n'ala, si, Chineke, bú Chineke nke mọ nile na anu-aru nile, bú madu, nwere, asi na otú nwoke emehie, Ì gēwesa kwa nzukọ a nile iwe?

23. Jehova we gwa Moses okwu, si,

24. Gwa nzukọ Israel okwu, si, Sinu na buruburu ebe-obibi nke Kora na Detan na Abairam rigo.

25. Moses we bilie, jekuru Detan na Abairam; ndi-okenye Israel we so ya.

26. o we gwa nzukọ Israel okwu, si, Biko, sinu n'ulo-ikwū ndikom ndia, bú ndi nēmebi iwu, wezuga onwe-unu, unu emetu-kwa-la ihe ọ bula ha nwere, ka ewe ghara ikpochapu unu nime nmehie-ha nile.

27. Ha we si n'ebe-obibi nke Kora na Detan na Abairam buruburu rigo: Detan na Abairam we puta, guzo onwe-ha n'ọnu-uzọ ulo-ikwū-ha, ha na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ntakiri-ha.

28. Moses we si, Na nka ka unu gāmara na Jehova ezitewom ime omume ndia nile; n'ihi na ha esiteghi n'obim.

29. Ọ buru na ọnwu dika ọnwu madu nile ka ndia gānwu, ọ buru kwa na ọ bu nleta madu nile ka aga eleta ha; Jehova eziteghm.

30. Ma ọ buru na ihe-òkìkè ọhu ka Jehova gēkè, ala ewe saghepu ọnu-ya, loda ha, ha na ihe nile ha nwere, ha we rida na ndu rue ala-mọ; unu gāmara kwa na ndikom ndia elelìwo Jehova.

31. O rue, mb͕e o kwubiri okwu ndia nile, na ala nke di n'okpuru ha b͕awara:

32. ala we saghe ọnu-ya, loda ha, na ulo nile ha, na madu nile Kora nwere, na àkù-ha nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 16