17. chiri-kwa-nu, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya, tiye kwa ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'elu ha, weta kwa-nu ha nso n'iru Jehova, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya, ọgu ihe-igu-ọku iri-na-abua na iri; gi onwe-gi kwa, na Eron, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya.
18. Ha we chiri, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya, tiye ọku n'elu ha, tukwasi kwa ha ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, we guzo n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, ha na Moses na Eron.
19. Kora we kpọkọta nzukọ Israel nile megide ha rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute: ewe me ka nzukọ ahu nile hu ebube Jehova anya.
20. Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,
21. Kewapunu onwe-unu n'etiti nzukọ nka, ka M'we me ka ha gwusia dika n'otù ntabi-anya.
22. Ha we da kpue iru-ha n'ala, si, Chineke, bú Chineke nke mọ nile na anu-aru nile, bú madu, nwere, asi na otú nwoke emehie, Ì gēwesa kwa nzukọ a nile iwe?
23. Jehova we gwa Moses okwu, si,
24. Gwa nzukọ Israel okwu, si, Sinu na buruburu ebe-obibi nke Kora na Detan na Abairam rigo.
25. Moses we bilie, jekuru Detan na Abairam; ndi-okenye Israel we so ya.
26. o we gwa nzukọ Israel okwu, si, Biko, sinu n'ulo-ikwū ndikom ndia, bú ndi nēmebi iwu, wezuga onwe-unu, unu emetu-kwa-la ihe ọ bula ha nwere, ka ewe ghara ikpochapu unu nime nmehie-ha nile.
27. Ha we si n'ebe-obibi nke Kora na Detan na Abairam buruburu rigo: Detan na Abairam we puta, guzo onwe-ha n'ọnu-uzọ ulo-ikwū-ha, ha na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ntakiri-ha.
28. Moses we si, Na nka ka unu gāmara na Jehova ezitewom ime omume ndia nile; n'ihi na ha esiteghi n'obim.