Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 16:15-28 Bible Nso (IGBOB)

15. Moses we we iwe di ọku nke-uku, ọ we si Jehova, Echela onyinye-inata-iru-ọma-ha iru: ọ dighi otù inyinya-ibu m'naraworo n'aka-ha, ọ dighi kwa otù onye nime ha M'mejọworo.

16. Moses we si Kora, Gi onwe-gi na nzukọ-gi nile nọ n'iru Jehova, gi, na ha, na Eron, echi:

17. chiri-kwa-nu, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya, tiye kwa ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'elu ha, weta kwa-nu ha nso n'iru Jehova, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya, ọgu ihe-igu-ọku iri-na-abua na iri; gi onwe-gi kwa, na Eron, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya.

18. Ha we chiri, nwoke ọ bula ihe-igu-ọku-ya, tiye ọku n'elu ha, tukwasi kwa ha ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, we guzo n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, ha na Moses na Eron.

19. Kora we kpọkọta nzukọ Israel nile megide ha rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute: ewe me ka nzukọ ahu nile hu ebube Jehova anya.

20. Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,

21. Kewapunu onwe-unu n'etiti nzukọ nka, ka M'we me ka ha gwusia dika n'otù ntabi-anya.

22. Ha we da kpue iru-ha n'ala, si, Chineke, bú Chineke nke mọ nile na anu-aru nile, bú madu, nwere, asi na otú nwoke emehie, Ì gēwesa kwa nzukọ a nile iwe?

23. Jehova we gwa Moses okwu, si,

24. Gwa nzukọ Israel okwu, si, Sinu na buruburu ebe-obibi nke Kora na Detan na Abairam rigo.

25. Moses we bilie, jekuru Detan na Abairam; ndi-okenye Israel we so ya.

26. o we gwa nzukọ Israel okwu, si, Biko, sinu n'ulo-ikwū ndikom ndia, bú ndi nēmebi iwu, wezuga onwe-unu, unu emetu-kwa-la ihe ọ bula ha nwere, ka ewe ghara ikpochapu unu nime nmehie-ha nile.

27. Ha we si n'ebe-obibi nke Kora na Detan na Abairam buruburu rigo: Detan na Abairam we puta, guzo onwe-ha n'ọnu-uzọ ulo-ikwū-ha, ha na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ntakiri-ha.

28. Moses we si, Na nka ka unu gāmara na Jehova ezitewom ime omume ndia nile; n'ihi na ha esiteghi n'obim.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 16