Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 16:1-13 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma Kora, nwa Izha, nwa Kohat, nwa Livai, ya na Detan na Abairam, umu Eliab, na On, nwa Pelet, bú umu Reuben, chiri ndikom:

2. ha we bilie n'iru Moses, ha na ndikom ufọdu ndi sitere n'umu Israel, ọgu ndi isi nzukọ iri-na-abua na iri, ndi akpọrọ ibia na nzute, ndikom amara aha-ha:

3. ha we kpọkọta onwe-ha imegide Moses na imegide Eron, si ha, O zuworo unu, n'ihi na nzukọ Israel nile, ha nile n'otù n'otù, di nsọ, ọ bu kwa n'etiti ha ka Jehova nọ: ọ̀ bu kwa gini mere unu nēbuli onwe-unu kari nkpọkọta nke Jehova?

4. Moses we nu ya, we da kpue iru-ya n'ala:

5. o we gwa Kora, gwa kwa nzukọ-ya nile, okwu, si, N'ututu Jehova gēme ka amara ndi O nwere, na onye di nsọ, na onye Ọ gēme ka ọ biarue nso Ya: Onye Ọ gārọputa, onye ahu ka Ọ gēme kwa ka ọ biarue nso Ya.

6. Menu nka; chirinu n'onwe-unu ihe-igu-ọku, Kora, na nzukọ-ya nile;

7. tiye-kwa-nu ọku nime ha, tukwasi kwa n'elu ha ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Jehova echi: ọ gēru kwa na nwoke ahu nke Jehova gārọputa, onye ahu bu onye nsọ: o zuworo unu, umu Livai.

8. Moses we si Kora, Biko, nurunu, umu Livai:

9. Ọ̀ bu unu ihe ntà na Chineke nke Israel akpawo ókè n'etiti unu na nzukọ Israel, ime ka unu biarue nso Ya; ifè òfùfè nke ebe-obibi Jehova, na iguzo n'iru nzukọ ahu ijere ha ozi;

10. Ọ we me ka i biarue nso, gi na umu-nne-gi niile, bú umu Livai? ùnu nācho kwa ọlu nchu-àjà?

11. N'ihi ya gi onwe-gi na nzukọ-gi nile bu ndi nēzukọ imegide Jehova: ma Eron, gini ka ọ bu na unu nātamu ntamu megide ya?

12. Moses we ziga ikpọ Detan na Abairam, bú umu Eliab: ha we si, Ayi agaghi-arigo:

13. ọ̀ bu ihe ntà na i mewo ka ayi si n'ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya rigoputa, ime ka ayi nwua n'ọzara nka, ma i ghaghi ime kwa onwe-gi onye-isi-ayi?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 16