Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 15:7-19 Bible Nso (IGBOB)

7. Manya-vine iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu, otù uzọ n'uzọ atọ nke otù hin, ka i gēweta kwa nso, ka ọ buru ihe ísì utọ isurere Jehova.

8. Ọzọ, mb͕e i nēme nwa-oke-ehi ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ma-ọbu àjà ọzọ, imezu nkwa, ma-ọbu ichu àjà-udo anāchuru Jehova:

9. ọ gēweta kwa nso, tiyere nwa-oke-ehi ahu, onyinye-inata-iru-ọma, bú uzọ atọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara na nkera hin nke manu.

10. Manya-vine ka i gēweta kwa nso iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu, nkera hin, ka ọ buru àjà-ọku nke ihe ísì utọ isurere Jehova.

11. Otú a ka agēmere otù oke-ehi, ma-ọbu otù ebulu, ma-ọbu otù nwa nime aturu ma-ọbu nime ewu.

12. Dika ọnu-ọgugu ihe nke unu nēdozi si di, otú a ka unu gēmere ihe ọ bula dika ọnu-ọgugu-ha si di.

13. Onye ọ bula amuru n'ala gēme ihe ndia otú a, n'iweta nso àjà-ọku nke ihe ísì utọ isurere Jehova.

14. ọzọ mb͕e ọbìa nọ n'ala-unu dika ọbìa, ma-ọbu onye ọ bula nọ n'etiti unu rue ọb͕ọ nile unu, mb͕e ọ gēme àjà-ọku nke ihe ísì utọ anēsurere Jehova; dika unu si eme, otú a ka ọ gēme.

15. Nime nkpọkọta nka, otù ukpuru diri unu, di-kwa-ra ọbìa nke nọ dika ọbìa, bú ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ nile unu: dika unu si di, otú a ka ọbìa ahu gādi n'iru Jehova.

16. Otù iwu na otù ikpé gādiri unu, di-kwa-ra ọbìa nke nọ dika ọbìa n'ala-unu.

17. Jehova we gwa Moses okwu, si,

18. Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu gābà n'ala ahu ebe Mu onwem nēme ka unu ba,

19. ọ gēru kwa, mgbe unu nēri nime nri ala ahu, na unu gēbuliri Jehova àjà-nbuli.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 15