N'ihi na ọ bu okwu Jehova ka ọ lelíworo anya, n'ihi kwa na ọ bu ihe O nyere n'iwu ka o mebiworo; agēbipu nkpuru-obi ahu ebipu, ajọ omume-ya gādikwasi ya.