Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 14:26-34 Bible Nso (IGBOB)

26. Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,

27. Rùe ole mb͕e ka M'gānagide nzukọ ọjọ nka nke nātamu ntamu megidem? ntamu nile nke umu Israel, nke ha onwe-ha nātamu megidem, ka M'nuworo.

28. Si ha, Mu onwem nādi ndu, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, dika unu kwuworo na ntim, otú a ka M'nāghaghi ime unu:

29. n'ọzara nka ka ozu-unu ga-ada; ndi-unu nile agukọtara agukọta, dika ọnu-ogugu nile unu si di, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, ndi tamuworo ntamu megidem,

30. unu onwe-unu agaghi-abà n'ala ahu ma-ọli, nke M'buliri akam ime ka unu biri nime ya, ma-ọbughi Keleb nwa Jefune na Joshua nwa Nun.

31. Ma umu-ntakiri-unu, ndi unu siri na ha gāghọ ihe-nluta-n'agha, M'gēme kwa ka ha ba, ha gāma kwa ala ahu nke unu juru aju.

32. Ma unu onwe-unu, ozu-unu gāda n'ọzara nka.

33. Umu-unu gābu kwa ndi-ọzùzù-aturu n'ọzara ọgu arọ abua, ha gēbu kwa ọkwukwa-iko nile unu, rue mb͕e ozu-unu gāgwusi n'ọzara.

34. Dika ọnu-ọgugu ubọchi nke unu ji ledo ala ahu anya si di, bú ọgu ubọchi abua, otù ubọchi otù arọ, otù ubochi otù arọ, otù a ka unu gēbu ajọ omume nile unu, ọgu arọ abua, unu gāma kwa iju-ajum.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 14