Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 14:19-30 Bible Nso (IGBOB)

19. Biko, b͕aghara ajọ omume nke ndi nka dika idi-uku nke ebere-Gi si di, na dika I b͕agharaworo ndi nka, site n'Ijipt we rue ub͕u a.

20. Jehova we si, Ab͕agharawom dika okwu-gi si di:

21. ma otù ọ di, Mu onwem nādi ndu, uwa nile gējuputa kwa n'ebube Jehova;

22. n'ihi na ndikom ahu nile ndi huworo ebubem, na ihe-iriba-amam nile, nke M'meworo n'Ijipt na n'ọzara, ma ha nwaworom ub͕ò iri a, ha egeghi kwa olum nti;

23. ha agaghi-ahu ala ahu ma-ọli nke M'ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha, ndi nile nke nēlelìm anya agaghi-ahu kwa ya:

24. ma orùm Keleb, n'ihi na mọ di iche nọ n'ime ya, n'ihi kwa na o nēsozum n'azu, M'gēme kwa ka ọ ba n'ala ahu ebe ọ bara; nkpuru-ya gēnweta kwa ya.

25. Ma ndi Amalek na ndi Kenean bi na ndagwurugwu a: echi chigharianu, buli-kwa-ra onwe-unu ije je n'ọzara n'uzọ Oké Osimiri Uhie.

26. Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,

27. Rùe ole mb͕e ka M'gānagide nzukọ ọjọ nka nke nātamu ntamu megidem? ntamu nile nke umu Israel, nke ha onwe-ha nātamu megidem, ka M'nuworo.

28. Si ha, Mu onwem nādi ndu, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, dika unu kwuworo na ntim, otú a ka M'nāghaghi ime unu:

29. n'ọzara nka ka ozu-unu ga-ada; ndi-unu nile agukọtara agukọta, dika ọnu-ogugu nile unu si di, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, ndi tamuworo ntamu megidem,

30. unu onwe-unu agaghi-abà n'ala ahu ma-ọli, nke M'buliri akam ime ka unu biri nime ya, ma-ọbughi Keleb nwa Jefune na Joshua nwa Nun.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 14