Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 14:11-19 Bible Nso (IGBOB)

11. Jehova we si Moses, Rùe ole mb͕e ka ndi nka gēlelìm anya? ọ̀ bu kwa rue ole mb͕e ka ha nāgaghi-ekwe na Mu, n'ihi ihe-iriba-ama nile nke M'meworo n'etiti ha?

12. M'gēwere ajọ ọria nēfe efe tib͕ue ha, M'gānapu kwa ha ihe ha nwere, M'gēme kwa gi ka i ghọ mba di uku di kwa ike kari ha.

13. Moses we si Jehova, Ndi Ijipt gānu kwa ya; n'ihi na I were ike-Gi me ka ndi nka si n'etiti ha rigoputa;

14. ha gāgwa kwa ndi bi n'ala nka okwu a: ha anuwo na Gi onwe-gi, Jehova, nọ n'etiti ndi nka; n'ihi na anya na anya ka ahuworo Gi onwe-gi, Jehova, igwe-oji-Gi nēguzo kwa n'elu ha, ọ bu kwa n'ogidi igwe-oji ka Gi onwe-gi nēje ije n'iru ha n'ehihie, na n'ogidi ọku n'abali.

15. Ma asi na I me ka ndi nka nwua dika otù onye, mba nile ndi nuworo akukọ bayere Gi gēkwu kwa, si,

16. N'ihi na Jehova apughi ime ka ndi nka ba n'ala ahu nke Ọ ṅuru ha iyi inye ha, n'ihi ya ka O b͕uworo ha n'ọzara.

17. Ma ub͕u a, biko, ka ike Onye-nwe-ayi di uku, dika I kwuworo, si,

18. Jehova adighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ nāba uba n'ebere, Ọ nāb͕aghara kwa ajọ omume na njehie, ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmaghi; Ọ nēwere kwa ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ.

19. Biko, b͕aghara ajọ omume nke ndi nka dika idi-uku nke ebere-Gi si di, na dika I b͕agharaworo ndi nka, site n'Ijipt we rue ub͕u a.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 14