Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 11:8-16 Bible Nso (IGBOB)

8. Ndi Israel jeghariri, chikọta ya, were nkume-igwe-nri gwe ya, ma-ọbu na ha suru ya n'ikwè, we sie ya n'ite, me ya ka ọ buru ob͕e achicha: idetu ya ire ọ di ka idetu ihe eji manu si esi.

9. Mb͕e igirigi dakwasiri ọmuma-ulo-ikwū ahu n'abali, manna we dakwasi ya.

10. Moses we nu ndi Israel ka ha nākwa ákwá n'ab͕uru nile ha, nwoke ọ bula n'ọnu-uzọ ulo-ikwū-ya: iwe nke Jehova we di ọku nke-uku; ọ jọ-kwa-ra njọ n'anya Moses.

11. Moses we si Jehova, N'ìhi gini ka I ji mejọ orù-Gi? ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka m'nāhutaghi kwa amara n'iru Gi, na I nēbom ibu nke ndi nka nile?

12. Ọ̀ bu mu onwem turu ime ndi nka nile? ọ̀ bu mu onwem muru ha, na I nāsim, Kuru ha n'obi-gi, dika nna-nāzù-nwa si eku nwa nāṅu ara, rue ala ahu nke I ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha?

13. Òle ebe m'gēsi nwe anu inye ndi nka nile? n'ihi na ha nākwasom ákwá, si, Nye ayi anu, ka ayi we rie.

14. Apughm, nání mu onwem, ikuru ndi nka nile, n'ihi na ọ karirim arọ́.

15. Ma ọ buru na otú a ka Gi onwe-gi nēmem, biko, gbuziem, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi; ka m'ghara kwa ilekwasi ihe ọjọm anya.

16. Jehova we si Moses, Chikọtaram ọgu ndikom atọ na iri sitere na ndi-okenye Israel, ndi i maworo na ha onwe-ha bu ndi-okenye nke ndi Israel, na ndi nēle ha anya n'ọlu: gi chiri ha bia rue ulo-ikwū nzute, ka ha we soro gi guzo onwe-ha n'ebe ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 11