Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 11:22-35 Bible Nso (IGBOB)

22. Ọ̀ bu ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi ka agēb͕uru ha, ka o we zue ha? ọ̀ bu azù nile nke oké osimiri ka agāchikọtara ha, ka o we zue ha?

23. Jehova we si Moses, Aka Jehova, ọ̀ ghọwo nkpunkpu aka? ub͕u a ka i gāhu ma okwum gērere gi ma-ọbu na ọ gaghi-ere.

24. Moses we pua, gwa ndi Israel okwu nile nke Jehova: o we chikọta ọgu ndikom atọ na iri sitere na ndi-okenye nke ndi Israel, guzo ha buruburu Ulo-ikwū ahu.

25. Jehova we ridata n'igwe-oji ahu, gwa ya okwu, nara ufọdu nime Mọ ahu nke dikwasiri ya, tiyekwasi n'ọgu ndi-okenye atọ na iri ahu: o rue, mb͕e Mọ ahu bekwasiri ha, na ha buru amuma, ma ha emeghi ya ọzọ.

26. Ma ndikom abua fọduru n'ọmuma-ulo-ikwū, aha nke otù onye nime ha bu Eldad, aha nke ibe-ya bu Midad: Mọ ahu we bekwasi ha; ha onwe-ha di kwa n'etiti ndi edere aha-ha n'akwukwọ, ma ha apughi jerue Ulo-ikwū ahu: ha we bū amuma n'ọmuma-ulo-ikwū.

27. Otù okorọbia we b͕a ọsọ, gosi Moses, si, Eldad na Midad nēbu amuma n'ọmuma-ulo-ikwū.

28. Joshua nwa Nun, onye nējere Moses ozi, bú otù onye nime ndikom-ya arọputaworo, we za, si, Onye-nwem Moses, b͕ochie ha.

29. Moses we si ya, Ọ̀ bu onye nēkwo ekworo ka i burum? ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ndi Jehova nile bu ndi-amuma ka Jehova we tiyekwasi ha Mọ-Ya!

30. Moses, ya na ndi-okenye Israel, we chikọta onwe-ha n'ọmuma-ulo-ikwū.

31. Otù ifufe we si n'ebe Jehova nọ bulie ije, we keputa nnunu quail n'oké osimiri, rapu ha n'akuku ọmuma-ulo-ikwū, dika ije otù ubọchi n'otù akuku, na dika ije otù ubọchi n'akuku. nke-ọzọ, buruburu ọmuma-ulo-ikwū, na dika cubit abua n'elu iru ala.

32. Ndi Israel we bilie ubọchi ahu nile, na abali-ya nile, na echi-ya nile, chikọta nnunu quail ahu: onye nāchikọta ntà chikọtara homer iri: ha we were ha b͕asara onwe-ha n'ebe nile buruburu-ọmuma-ulo-ikwū

33. Mb͕e anu ahu nādi n'etiti ezé-ha ub͕u a, tutu atabie ya, iwe Jehova we di ọku megide ndi Israel, Jehova we were ihe-otiti riri nne nke-uku tie ndi Israel.

34. Ewe kpọ aha ebe ahu Kibrot-hataava: n'ihi na n'ebe ahu ka ha lìri ndi Israel ndi nāchọ ajọ ọchichọ.

35. Ndi Israel siri na Kibrot-hataava bulie ije rue Hazerot; ha we nọ na Hazerot.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 11