Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 11:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. Ndi Israel we di ka ndi nātamu ntamu, nēkwu ihe ọjọ na nti Jehova: Jehova we nu ya, iwe-Ya we di ọku; ọku nke Jehova we re n'etiti ha, we ripia madu ufọdu nime nsọtu ọmuma-ulo-ikwū.

2. Ndi Israel we tikue Moses; Moses we kpere Jehova ọku ahu we bilata.

3. Ewe kpọ aha ebe ahu Tabera: n'ihi na ọku nke Jehova nēre n'etiti ha.

4. Ìgwè ndi gwara ọgwa nke nọ n'etiti ha we chọ ajọ ọchichọ: umu Israel we kwa kwa ákwá ọzọ, si, Ònye gēme ka ayi rie anu?

5. Ayi nēcheta azù nke ayi nēri n'Ijipt nāzughi azú; ya na cucumbers na melons, na leeks, na onions, na garlic:

6. ma ub͕u a nkpuru-obi ayi akpọwo nku, ọ dighi ihe ọ bula ayi nwere: ọ bu nání manna nka di n'iru ayi.

7. Ma manna ahu, dika nkpuru coriander ka ọ bu, iru-ya di kwa ka iru bdellium.

8. Ndi Israel jeghariri, chikọta ya, were nkume-igwe-nri gwe ya, ma-ọbu na ha suru ya n'ikwè, we sie ya n'ite, me ya ka ọ buru ob͕e achicha: idetu ya ire ọ di ka idetu ihe eji manu si esi.

9. Mb͕e igirigi dakwasiri ọmuma-ulo-ikwū ahu n'abali, manna we dakwasi ya.

10. Moses we nu ndi Israel ka ha nākwa ákwá n'ab͕uru nile ha, nwoke ọ bula n'ọnu-uzọ ulo-ikwū-ya: iwe nke Jehova we di ọku nke-uku; ọ jọ-kwa-ra njọ n'anya Moses.

11. Moses we si Jehova, N'ìhi gini ka I ji mejọ orù-Gi? ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka m'nāhutaghi kwa amara n'iru Gi, na I nēbom ibu nke ndi nka nile?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 11