Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 10:7-20 Bible Nso (IGBOB)

7. Ma n'ikpọkọta nkpọkọta Israel unu gāfù opì, ma unu emela ka ọ dasie uda ike.

8. Ọ bu umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gēwere opì abua ahu fua; ha gābu-kwa-ra unu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ nile unu.

9. Ọzọ, mb͕e unu nēbu agha n'ala-unu megide onye-nkpab͕u nākpab͕u unu, unu gēwere opì me ka ha dasie uda ike; agēcheta kwa unu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, agāzọputa kwa unu n'aka ndi-iro-unu.

10. Ọ bu kwa n'ubọchi ọṅu-unu, na na mb͕e nile unu akara àkà, na nime nmalite ọnwa nile unu, ka unu gēwere opì abua ahu fùa n'elu àjà-nsure-ọku nile unu, na n'elu ihe àjà nke àjà-udo nile unu; ha gābu-kwa-ra unu ihe-ncheta n'iru Chineke-unu; Mu onwem bu Jehova, Chineke-unu.

11. O rue n'arọ nke-abua, n'ọnwa nke-abua, n'ubọchi nke-orú n'ọnwa ahu, na igwe-oji ahu siri n'elu ebe-obibi nke ihe-àmà ahu rigo.

12. Umu Israel we si n'ọzara Sainai bulie ije dika nbuli-ije nile ha si di; igwe-oji ahu we nọdu n'ọzara Peran.

13. Ma ha buru uzọ bulie ije n'okwu-ọnu Jehova n'aka Moses.

14. Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Juda buru uzọ bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Nahshon nwa Aminadab nọ n'isi usu-ndi-agha-ya.

15. Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Isaka bu Netanel nwa Zua.

16. Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Zebulun bu Eliab nwa Hilon.

17. Ewe weda ebe-obibi ahu; umu Giashon na umu Merari, ndi nēbu ebe-obibi ahu, we bulie ije.

18. Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Reuben we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Elizua nwa Shedeua nọ n'isi usu-ndi-agha-ya.

19. Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Simeon bu Shelumiel nwa Zurishadai.

20. Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Gad bu Eliasaf nwa Deuel.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 10