Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 1:41-54 Bible Nso (IGBOB)

41. ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Asha, ha di orú nnù uzọ ise na nnù atọ na ọgu iri-na-ise.

42. Nke umu Naftali, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnuọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

43. ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Naftali, ha di orú nnù uzọ isi na nnù iri-na-atọ na ọgu iri.

44. Ndia bu ndi agukọtara agukọta, ndi Moses na Eron gukọtara, ha na ndi-isi Israel, bú ndikom iri na abua: otù nwoke otù nwoke diri ulo nna-ya-hà ka ha bu.

45. Ndi nile nke umu Israel agukọtara agukọta we di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha n'Israel;

46. ọbuná ndi nile agukọtara agukọta we di orú nnù ọgu uzọ atọ na uzọ iri-na-ise, na nnù asatọ, na ọgu iri-na-asa, na iri.

47. Ma ndi Livai, dika ebo nke ndi bu nna-ha si di, agukọtaghi ha n'etiti ha.

48. N'ihi na Jehova gwara Moses okwu, si,

49. Nání, agukọtala ebo Livai, aguta-kwa-la ọnu-ọgugu-ha n'etiti umu Israel:

50. ma gi onwe-gi me ndi Livai ka ha buru ndi nēlekọta ebe-obibi ihe-àmà, ndi nēlekọta kwa lhe-ya nile, ndi nēlekọta kwa ihe nile diri ya: ha onwe-ha ganēbu ebe-obibi ahu, na ihe-ya nile: ha onwe-ha gēje-kwa-ra ya ozi, ọ bu kwa buruburu ebe-obibi ahu ka ha gāma ulo-ikwū-ha.

51. Ma na nbuli-ije nke ebe-obibi ahu, ndi Livai gēweda ya: ọzọ, n'ọmuma nke ebe-obibi ahu, ndi Livai gēguzo ya ọtọ: ma onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua.

52. Umu Israel gāma kwa ulo-ikwū-ha, nwoke ọ bula n'akuku ọmuma-ulo-ikwū-ya, na nwoke ọ bula n'akuku ọkọlọtọ-ya, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di.

53. Ma ndi Livai gāma ulo-ikwū-ha buruburu ebe-obibi ihe-àmà ahu, ka iwe we ghara idi n'aru nzukọ umu Israel: ndi Livai gēdebe kwa ihe-ndebe nke ebe-obibi ihe-àmà ahu.

54. Umu Israel we me otú a; dika ihe nile nke Jehova nyere Moses n'iwu si di, otú a ka ha mere.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 1