Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 1:20-30 Bible Nso (IGBOB)

20. Ma umu Reuben, bú ọkpara Israel, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, onye na isi-ya onye na isi-ya, nwoke ọ bula site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

21. ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Reuben, ha di orú nnù uzọ ise na nnù iri-na-isi na ọgu ise.

22. Nke umu Simeon, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, ndi-ha agukọtara agukọta, n'ọnu-ọgugu aha, onye na isi-ya onye na isi-ya, nwoke ọ bula site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

23. ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Simeon, ha di orú nnù uzọ asa na nnù asatọ na ọgu ise.

24. Nke umu Gad, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

25. ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Gad, ha di orú nnù uzọ ise na nnù iri-na-anọ na ọgu abua na iri.

26. Nke umu Juda, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'onu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara oru arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

27. ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Juda, ha di orú nnù uzọ iteghete na nnù isi na ọgu iri.

28. Nke umu Isaka, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

29. ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Isaka, ha di orú nnù uzọ isi na nnù iri-na-isi.

30. Nke umu Zebulun, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 1