Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Obadaia 1:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọhù Obadaia.Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri bayere Edom: Ayi anuwo ihe-ọnunu sitere n'ọnu Jehova, ezigawo kwa ukọ̀ n'etiti mba nile, si, Bilienu, ka ayi bilie imegide ya n'agha.

2. Le, ihe ntà n'etiti mba nile ka M'meworo gi ka i ghọ: ihe elelìworo anya nke-uku ka i bu.

3. Nganga nke obi-gi arafuwo gi, gi onye bi na nb͕awa nile nke nkume di elu, ebe di elu ka ebe-obibi-ya bu; onye nāsi n'obi-ya, Ònye gēme ka m'ridarue ala?

4. Ọ buru na i felie elu dika ugo, ọ buru kwa na ọ bu n'etiti kpakpando ka edoworo akwu-gi, n'ebe ahu ka M'gēme ka i si rida; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

5. Ọ buru na ndi-ori abiakute gi, ọ buru na ndi nāpunara madu ihe abia n'abali, (le otú alaworo gi n'iyì nke-uku!) hà agaghi-ezu ihe gēzuru ha n'ori? ọ buru na ndi nāghọrọ nkpuru-vine abiakute gi, hà agaghi-aghọfọ nkpuru nke fọduru itutukọ?

6. Le otú achọputaworo ihe Isọ nke-uku! le otú anubigaworo ọku ókè n'obi inwe àkù-ya ezobere!

7. Rue ókè-ala ka ndi nile gi na ha nọ n'ọb͕ub͕a-ndu zipuworo gi: ndi gi na ha nọ n'udo arafuwo gi, nwe ike imegide gi; nri-gi ka ha nēme ka ọ buru ọnyà n'okpuru gi: ọ dighi nghọta di nime ya.

8. Ọ̀ bughi n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ka M'gēme ka ndi-amam-ihe la n'iyì pua n'Edom, me kwa ka nghọta la n'iyì pua n'ugwu Isọ?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Obadaia 1