Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nehum 3:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. Ahuhu diri obodo ọbara! o juputasiri n'okwu-ugha na ndọka; ndọb͕u-anu adighi-apu na ya.

2. Ge nti olu utali, na olu nke ùzù wheel; na inyinya nāwuli awuli, na ub͕ọ-ala nāmali amali;

3. na onye-inyinya nēme ka inyinya-ya rigo, na mma-agha nēb͕upu eb͕upu, na ube nēb͕u àmùmà; na ọtutu ndi eb͕uru eb͕u, na oké obo ozu; ọ dighi kwa ọgwugwu diri ozu-ha; ha nāsu ngọngọ n'ozu-ha:

4. n'ihi iba-uba nke ikwa-iko nile nke nwanyi nākwa iko onye mara nma nke-uku, bú nwanyi nwe mb͕asi di iche iche, nke nēre mba di iche iche site n'ikwa-iko-ya nile, na ab͕uru di iche iche site na mb͕asi-ya nile.

5. Le, Mu nēmegide gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gēkpughe kwa ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi n'iru-gi, me ka mba nile hu ọtọ-gi, na ala-eze nile ka ha hu ihere-gi.

6. M'gātukwasi kwa gi ihe-árú di iche iche, M'gākpọ kwa gi ihe-nzuzu, do gi ka ihe ile anya.

7. O gēru kwa, na ndi nile ndi nāhu gi gāb͕anari gi, si, Ebibiwo Nineve: ònye gēgosi ya ebere o ji n'aru ya? Òle ebe M'gāchọputara gi ndi-nkasi-obi?

8. Ì di nma kari No-amon, nke bi n'etiti osimiri Nail nile, nke miri di ya buruburu; nke ékpè-ya bu oké osimiri, oké osimiri ka mb͕idi-ya sitere?

9. Etiopia bu ume-ya, ya na Ijipt, ọ dighi kwa ọgwugwu diri ya; Put na Lubim buri ndi-iye-aka-gi.

10. Ọbuná obodo ahu ka emere ka ọ je biri n'ala ọzọ, ọ lara na ndọta-n'agha: atupia-kwa-ra umu-ya nāṅu ara n'isi èzí nile: ọ bu kwa ndi di nsọpuru ya ka ha fekwasiri nzà, eke-kwa-ra ndi uku ya nkpọrọ.

11. Gi onwe-gi gāṅubiga kwa manya ókè, i gābu onye zoro ezo; gi onwe-gi gāchọ kwa ebe siri ike, n'ihi onye-iro.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nehum 3