Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nehum 1:9-13 Bible Nso (IGBOB)

9. Gini ka unu nēchè megide Jehova? Ya onwe-ya nēme ka ọ gwusia: nkpab͕u agaghi-ebili nke ub͕ò abua.

10. N'ihi na ọ bu ezie na ha di ka ogwu tuhiri atuhi, buru kwa ndi ṅubigaworo manya ókè dika n'iṅubiga-manya-ókè-ha, ọku gēripia ha dika ahihia-ọka kpọnwusiri akpọnwu.

11. Nime gi ka otù onye siri puta, nke nēchè ihe ọjọ megide Jehova, nādu kwa ọdu ihe jọb͕uru onwe-ya.

12. Otú a ka Jehova siri: Ọ bu ezie na ha zuru okè, ba kwa uba otú a, ọbuná otú a ka agēb͕utu ha, ọ gāgabiga kwa. Ọ bu ezie na ewedawom i n'ala, ma M'agaghi-eweda kwa gi n'ala ọzọ.

13. Ma ub͕u a ka M'gāb͕ajipu nkpọrọ yoke-ya n'olu-gi, ọ bu kwa ab͕u-gi nile ka M'gētibi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nehum 1