11. I kewa-kwa-ra oké osimiri n'iru ha, ha we gabiga n'etiti oké osimiri n'elu ala-akọrọ; ma I tubàra ndi nāchu ha na miri di omimi, dika nkume nime miri di ike.
12. Ọ bu kwa ogidi igwe-oji ka I nēwere du ha n'ehihie; I nēwere kwa ogidi ọku n'abali, inye ha ìhè n'uzọ ahu nke ha gēje ije nime ya.
13. Ọ bu kwa n'elu ugwu Sainai ka I ridara, si n'elu-igwe kpayere ha uka, I we nye ha ikpé ziri ezi na iwu ezi-okwu, na ezi ukpuru na ihe enyere n'iwu:
14. I me-kwa-ra ka ha mara ubọchi-izu-ike nsọ Gi, I were kwa ihe enyere n'iwu, na ukpuru, na iwu, nye ha n'iwu site n'aka Moses, bú orù-Gi: