Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nehemaia 9:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nka achikọtara umu Israel n'obubu-ọnu, na n'ákwà-nke, ájá dikwasi kwa ha.

2. Nkupuru Israel we kewaputa onwe-ha n'aru ndi ala ọzọ nile, guzo, kwuputa nmehie nile ha, na ajọ omume nile nke ndi bu nna-ha.

3. Ha we bilie n'ebe-nguzo-ha, gua n'akwukwọ iwu Jehova, bú Chineke-ha, otù uzọ n'uzọ anọ nke ubọchi; otù uzọ n'uzọ anọ kwa ka ha nēkwuputa, nākpọ kwa isi ala nye Jehova, bú Chineke-ha.

4. Jeshua, na Bani, na Kadmiel, na Shebania, na Buni, na Sherebia, na Bani, na Kenani, we bilie n'elu ihe-nrigo ndi Livai, were oké olu tikue Jehova, bú Chineke-ha.

5. Ndi Livai, bú Jeshua, na Kadmiel, na Bani, na Hashabneia, na Sherebia, na Hodia, na Shebania, na Petahia, we si, Bilienu, gọzie Jehova, bú Chineke-unu, site na mb͕e edighi-ebi rue mb͕e ebighi-ebi: ka ha gọzi kwa aha-Gi di nsọpuru, nke ebuliworo ya elu kari ngọzi na otuto nile.

6. Gi onwe-gi bu Jehova, nání Gi; Gi onwe-gi emewo elu-igwe, bú elu-igwe nke elu-igwe nile, na usu-ha nile, na uwa na ihe nile nke di n'elu ya, na oké osimiri nile na ihe nile nke di nime ha, Gi onwe-gi nēdebe kwa ha nile ndu; usu ihe elu-igwe nākpọ kwa isi ala nye Gi.

7. Gi onwe-gi, Jehova, bu Chineke ahu Nke rọputara Abram, me ka o si na Ua nke ndi Kaldea puta, I gu-kwa-ra aha-ya Abraham;

8. I hu-kwa-ra na obi-ya kwesiri ntukwasi-obi n'iru Gi, Gi na ya b͕a-kwa-ra ndu na I gēwere ala nke ndi Kenean na ndi Het na ndi-Amorait na ndi Perizait na ndi Jebus na ndi-Giagashait nye, bú iwere ya nye nkpuru-ya, I we me ka okwu-Gi guzosie ike; n'ihi na onye ezi omume ka I bu.

9. I hu-kwa-ra mweda-n'ala nke nna-ayi-hà n'Ijipt, nu kwa iti-nkpu-ha n'akuku Oké Osimiri Uhie;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nehemaia 9