Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nehemaia 8:14-18 Bible Nso (IGBOB)

14. Ha we chọputa ihe a edeworo n'iwu, bú na Jehova nyere iwu site n'aka Moses, ka umu Israel nọdu n'ulo-ntu n'ememe di n'ọnwa nke-asa:

15. na ka eme ka anu ka ekwusa kwa n'obodo-ha nile na nime Jerusalem, si, Puanu je n'ugwu, chita akwukwọ osisi olive, na akwukwọ osisi nēnye manu, na akwukwọ osisi myrtle, na igu nkwu, na akwukwọ nke osisi b͕ara n'ọhia, ime ulo-ntu, dika edeworo ya n'akwukwọ.

16. Ndi ahu we je, chita ha, mere onwe-ha ulo-ntu, nwoke ọ bula n'elu-ulo-ya, na n'ogige nile ha, na n'ogige nile nke ulo Chineke, na n'amá nke ọnu-uzọ-ama miri, na n'amá nke ọnu-uzọ-ama Efraim.

17. Nkpọkọta ahu nile nke ndi nālata site na ndọta-n'agha ahu mere ulo-ntu, we nọdu n'ulo-ntu-ha: n'ihi na umu Israel emeghi otú a site n'ubọchi Jeshua nwa Nun rue ubọchi ahu. Oké ọṅù di uku we di.

18. O we nāgu n'akwukwọ iwu Chineke kwa-ubọchi, site n'ubọchi mbu rue ubọchi ikpe-azu. Ha we me ememe ahu ubọchi asa; ma n'ubọchi nke-asatọ ubọchi-nb͕ochi di, dika ikpé-ya si di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nehemaia 8