Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nehemaia 6:8-19 Bible Nso (IGBOB)

8. M'we zigara ya ozi, si, Ọ dighi ka okwu ndia si di nke gi onwe-gi nēkwu, kama gi onwe-gi nēchèputa ha n'obi-gi.

9. N'ihi na ha nile nēme ka ayi tua egwu, si, Aka-ha gākudapu n'ije-ozi a, agaghi-eje kwa ya. Ma ub͕u a Gi me ka akam abua di ike.

10. Ma mu onwem batara n'ulo Shemaia nwa Delaia nwa Mehetabel, ma emechidoworo onye ahu uzọ; o we si, Ka ayi zukọta n'ulo Chineke, n'etiti ulo uku Chineke, ka ayi mechi kwa uzọ nile nke ulo uku Chineke: n'ihi na ha nābia ib͕u gi; e, n'abali ka ha nābia ib͕u gi.

11. M'we si, Nwoke dika mu onwem, ọ̀ gāb͕alaga? ònye di kwa, nke di ka mu onwem, nke gābà n'ulo uku Chineke, we di ndu? m'gaghi-abà nime.

12. M'we mata, ma, le, ọ bughi Chineke zitere ya: kama okwu amuma nka ka o kwuru imegidem: ma Sanbalat na Tobaia goro ya.

13. N'ihi nka ka egoro onye ahu, ka m'we tua egwu, me otú a, we mehie, ka ha we nwe kwa ya inyem aha ọjọ, ka ha we tam uta.

14. Chinekem, cheta Tobaia, cheta kwa Sanbalat, dika omume-ha ndia si di, ọzọ kwa, cheta Noadia, bú onye-amuma-nwayi, cheta kwa ndi-amuma fọduru, ndi nēme ka m'tua egwu.

15. Ewe luzue mb͕idi ahu n'ubọchi nke-orú-na-ise nke ọnwa Elul, n'ọgu ubọchi abua na iri na abua.

16. O rue, mb͕e ndi-iro-ayi nile nuru ya, na mba nile nke di ayi buruburu turu egwu, we da ada nke-uku n'anya nke aka ha: ha we mara na esitere n'aka Chineke-ayi je ozi a.

17. Ọzọ, na mb͕e ahu ndi Juda amara aha-ha nēzigara Tobaia ọtutu akwukwọ-ozi, akwukwọ-ozi nke Tobaia nābiaru kwa ha aka.

18. N'ihi na ọtutu madu di nime Juda ndi nwere iyi ha ṅuru ya, n'ihi na di nwa-nwayi Shekania nwa Ara ka ọ bu; Jehohanan nwa-ya lu-kwa-ra nwa-nwayi Meshulam nwa Berekaia na nwunye.

19. Ha nēkwu kwa okwu bayere ezi omume-ya nile n'irum, ha nēburu kwa okwum nile pukuru ya. Akwukwọ-ozi ka Tobaia ziri ime ka m'tua egwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nehemaia 6