Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nehemaia 13:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. N'ubọchi ahu ka ha guru n'akwukwọ Moses na nti ndi Israel; ewe hu ihe edeworo nime ya, bú na onye Amon na onye Moab agaghi-abà na nkpọkọta ndi Chineke rue mb͕e ebighi-ebi;

2. n'ihi na ha ejighi achicha na miri bia n'iru umu Israel, kama ha gotara Belam imegide ha, ikọcha ha: ma Chineke-ayi b͕anwere nkọcha ahu ka ọ ghọ ngọzi.

3. O rue, mb͕e ha nuru iwu ahu, na ha kewapuru ndi nile gwara ọgwa n'Israel.

4. Ma tutu ihe a eme, Elaiashib, bú onye-nchu-àjà, onye edoro onye-isi ime-ulo nke ulo Chineke-ayi, ebe ọ bu ọgọ Tobaia,

5. ọ we doziere ya ime-ulo uku, ma n'ebe ahu ka ha nētiye na mb͕e gara aga onyinye-inata-iru-ọma, na frankincense, na ihe ulo Chineke nile, na otù uzọ n'uzọ iri nke ọka na manya-vine ọhu na manu, bú ihe enyere n'iwu nke ndi Livai na ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama; na àjà-nbuli nke ndi-nchu-aja.

6. Ma na mb͕e a nile anọghm na Jerusalem; n'ihi na n'arọ nke-orú-na-iri-na-abua nke Atakasakses, bú eze Babilon, ka m'biakutere eze, ma n'ọgwugwu ubọchi ufọdu ariọrọm eze ka ọ rapum:

7. m'we biarue Jerusalem, ghọta ihe ọjọ ahu nke Elaiashib mere bayere Tobaia, n'idoziri ya ime-ulo n'ogige ulo Chineke.

8. O we dim njọ nke-uku: m'we si n'ime-ulo ahu tupu ihe nile nke ulo Tobaia n'èzí.

9. M'we kwue, ha we me ka ime-ulo nile di ọcha: m'we chighachi n'ebe ahu ihe ulo Chineke, ha na onyinye-inata-iru-ọma na frankincense.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nehemaia 13