Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nehemaia 12:9-24 Bible Nso (IGBOB)

9. Bakbukia na Uno, bú umu-nne-ha, nọ kwa na ncherita-iru ha, dika ihe-ndebe nile ha si di.

10. Jeshua we mua Joiakim, Joiakim mua Elaiashib, Elaiashib mua Joiada,

11. Joiada, mua Jonatan, Jonatan mua Jadua.

12. Ma n'ubọchi Joiakim ndi-nchu-àjà di, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna: nke Seraia, Meraia; nke Jeremaia, Hananaia;

13. nke Ezra, Meshulam; nke Amaraia, Jehohanan;

14. nke Meluki, Jonatan; nke Shebania, Josef;

15. nke Harim, Adna; nke Meraiot, Helkaia;

16. nke Ido, Zekaraia; nke Gineton, Meshulam;

17. nke Abaija, Zikri; nke Miniamin, nke Moadia, Piltai;

18. nke Bilga, Shamua; nke Shemaia, Jehonatan;

19. nke Joiarib kwa, Matenai; nke Jedaia, Uzi;

20. nke Salai, Kalai; nke Amok, Iba;

21. nke Hilkaia, Hashabaia; nke Jedaia, Netanel.

22. Edewo ndi-Livai n'akwukwọ n'ubọchi Elaiashib na Joiada na Johanan na Jadua ibu ndi-isi ulo nke ndi bu nna: ndi-nchu-àjà kwa, n'ọbubu-eze Daraiọs, bú onye Peasia.

23. Edewo umu Livai n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi ahu, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna, we rue ubọchi Johanan nwa Elaiashib.

24. Ndi-isi ndi Livai kwa: Hashabaia, na Sherebia, na Jeshua nwa Kadimiel, na umu-nne-ha ndi nọ na ncherita-iru ha, ito Chineke na ikele ekele, dika ihe Devid, bú onye nke Chineke, nyere n'iwu si di, otù ihe-ndebe nēcherita ihe-ndebe ọzọ iru.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nehemaia 12