Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nehemaia 12:33-40 Bible Nso (IGBOB)

33. na Azaraia, na Ezra, na Meshulam,

34. na Juda, na Benjamin, na Shemaia, na Jeremaia,

35. na ufọdu nime umu nke ndi-nchu-àjà, ndi chiri opì: na Zekarai nwa Jonatan, nwa Shemaia, nwa Matanaia, nwa Maikaia, nwa Zakua, nwa Esaf;

36. na umu-nne-ya, bú Shemaia, na Azarel, na Milalai, na Gilalai, na Maai, na Netanel, na Juda, na Hanani, ndi chiri ihe abù nke Devid, bú onye nke Chineke; Ezra, bú ode-akwukwọ, nọ kwa n'iru ha:

37. ha we rigo n'akuku ọnu-uzọ-ama isi-iyi, na ncherita-iru ha kwa, n'elu ihe-nrigo obodo Devid, nime nrigo mb͕idi, site n'akuku di n'elu n'ebe ulo Devid di, we rue ọnu-uzọ-ama miri n'akuku ọwuwa-anyanwu.

38. Usu nke-abua nke ndi nēkele ekele nke nēje izute ha je-kwa-ra, mu onwem so-kwa-ra ha je, mu na nkera ndi-ayi, n'elu mb͕idi, site n'akuku di n'elu n'ebe ulo-elu nke ite-ọku uku di, we rue mb͕idi sara mbara;

39. site kwa n'akuku di n'elu n'ebe ọnu-uzọ-ama Efraim di, na n'akuku ọnu-uzọ-ama ochie, na n'akuku ọnu-uzọ-ama azù, na ulo-elu Hananel, na ulo-elu Hamea, we rue ọnu-uzọ-ama aturu: ha we guzo n'ọnu-uzọ-ama ulo-nche.

40. Usu abua ahu nke ndi nēkele ekele we guzo n'ulo Chineke, ha na mu onwem, nkera ndi nọchiri anya eze nọye-kwa-ram:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nehemaia 12