18. nke Bilga, Shamua; nke Shemaia, Jehonatan;
19. nke Joiarib kwa, Matenai; nke Jedaia, Uzi;
20. nke Salai, Kalai; nke Amok, Iba;
21. nke Hilkaia, Hashabaia; nke Jedaia, Netanel.
22. Edewo ndi-Livai n'akwukwọ n'ubọchi Elaiashib na Joiada na Johanan na Jadua ibu ndi-isi ulo nke ndi bu nna: ndi-nchu-àjà kwa, n'ọbubu-eze Daraiọs, bú onye Peasia.
23. Edewo umu Livai n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi ahu, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna, we rue ubọchi Johanan nwa Elaiashib.
24. Ndi-isi ndi Livai kwa: Hashabaia, na Sherebia, na Jeshua nwa Kadimiel, na umu-nne-ha ndi nọ na ncherita-iru ha, ito Chineke na ikele ekele, dika ihe Devid, bú onye nke Chineke, nyere n'iwu si di, otù ihe-ndebe nēcherita ihe-ndebe ọzọ iru.
25. Matanaia na Bakbukia na Obadia na Meshulam na Talmon na Akub bu ndi-ọnu-uzọ-ama nēdebe ihe-ndebe-ha n'ulo-nchikọbata-ihe nile nke ọnu-uzọ-ama nile.
26. Ndia nọ n'ubọchi Joiakim nwa Jeshua, nwa Jozadak, na n'ubọchi Nehemaia, bú onye nāchi ala, na nke Ezra, bú onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ.