Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nehemaia 12:18-26 Bible Nso (IGBOB)

18. nke Bilga, Shamua; nke Shemaia, Jehonatan;

19. nke Joiarib kwa, Matenai; nke Jedaia, Uzi;

20. nke Salai, Kalai; nke Amok, Iba;

21. nke Hilkaia, Hashabaia; nke Jedaia, Netanel.

22. Edewo ndi-Livai n'akwukwọ n'ubọchi Elaiashib na Joiada na Johanan na Jadua ibu ndi-isi ulo nke ndi bu nna: ndi-nchu-àjà kwa, n'ọbubu-eze Daraiọs, bú onye Peasia.

23. Edewo umu Livai n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi ahu, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna, we rue ubọchi Johanan nwa Elaiashib.

24. Ndi-isi ndi Livai kwa: Hashabaia, na Sherebia, na Jeshua nwa Kadimiel, na umu-nne-ha ndi nọ na ncherita-iru ha, ito Chineke na ikele ekele, dika ihe Devid, bú onye nke Chineke, nyere n'iwu si di, otù ihe-ndebe nēcherita ihe-ndebe ọzọ iru.

25. Matanaia na Bakbukia na Obadia na Meshulam na Talmon na Akub bu ndi-ọnu-uzọ-ama nēdebe ihe-ndebe-ha n'ulo-nchikọbata-ihe nile nke ọnu-uzọ-ama nile.

26. Ndia nọ n'ubọchi Joiakim nwa Jeshua, nwa Jozadak, na n'ubọchi Nehemaia, bú onye nāchi ala, na nke Ezra, bú onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nehemaia 12