Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nehemaia 12:15-29 Bible Nso (IGBOB)

15. nke Harim, Adna; nke Meraiot, Helkaia;

16. nke Ido, Zekaraia; nke Gineton, Meshulam;

17. nke Abaija, Zikri; nke Miniamin, nke Moadia, Piltai;

18. nke Bilga, Shamua; nke Shemaia, Jehonatan;

19. nke Joiarib kwa, Matenai; nke Jedaia, Uzi;

20. nke Salai, Kalai; nke Amok, Iba;

21. nke Hilkaia, Hashabaia; nke Jedaia, Netanel.

22. Edewo ndi-Livai n'akwukwọ n'ubọchi Elaiashib na Joiada na Johanan na Jadua ibu ndi-isi ulo nke ndi bu nna: ndi-nchu-àjà kwa, n'ọbubu-eze Daraiọs, bú onye Peasia.

23. Edewo umu Livai n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi ahu, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna, we rue ubọchi Johanan nwa Elaiashib.

24. Ndi-isi ndi Livai kwa: Hashabaia, na Sherebia, na Jeshua nwa Kadimiel, na umu-nne-ha ndi nọ na ncherita-iru ha, ito Chineke na ikele ekele, dika ihe Devid, bú onye nke Chineke, nyere n'iwu si di, otù ihe-ndebe nēcherita ihe-ndebe ọzọ iru.

25. Matanaia na Bakbukia na Obadia na Meshulam na Talmon na Akub bu ndi-ọnu-uzọ-ama nēdebe ihe-ndebe-ha n'ulo-nchikọbata-ihe nile nke ọnu-uzọ-ama nile.

26. Ndia nọ n'ubọchi Joiakim nwa Jeshua, nwa Jozadak, na n'ubọchi Nehemaia, bú onye nāchi ala, na nke Ezra, bú onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ.

27. Ma n'ira mb͕idi Jerusalem nye Chineke ha chọputara ndi Livai n'ebe-ha nile, ime ka ha biarue Jerusalem, ime ememe nke ira mb͕idi Jerusalem nye Chineke, ọbuná n'iṅuri-ọṅu, na n'ikele-ekele, na n'ibù-abù, n'ájà na une na n'ubọ-akwara.

28. Umu nke ndi-ọbù-abù we chikọta onwe-ha, ọbuná site na buruburu-ala nke di Jerusalem buruburu, site kwa n'obodo ntà nile nke ndi Netofa;

29. site kwa na Bet-gilgal, site kwa n'ọhia nile nke Geba na Azmavet: n'ihi na ndi-ọbù-abù wuru obodo ntà nye onwe-ha buruburu Jerusalem.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nehemaia 12