Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 8:24-35 Bible Nso (IGBOB)

24. Gideon we si ha, Ka m'riọ unu aririọ, nye-kwa-num, nwoke ọ bula nb͕a-aka nke ihe-nkwata-ya. (N'ihi ma ha nwere nb͕a-aka ọla-edo, n'ihi na ndi Ishmael ka ha bu.)

25. Ha si, Ayi gēnye ha nọ̄. Ha we b͕asa uwe, tubà n'ebe ahu, nwoke ọ bula nb͕a-aka nke ihe-nkwata-ya.

26. Ọtùtù nb͕a-aka ọla-edo nile nke ọ riọrọ we di nnù shekel ọla-edo anọ na ọgu ise; nāgughi ihe nile yiri ọnwa, na ihe nile anākwuba na nti, na uwe ododo nile nke di n'aru ndi-eze Midian, nāgughi kwa ihe-inya-n'olu nile nke di n'olu camel-ha.

27. Gideon we me ya ka ọ buru ephod, guzo ya ọtọ n'obodọ-ya, bú Ọfra: Israel nile we soro ya nākwa iko n'ebe ahu: o we ghọrọ Gideon, ghọ-kwa-ra ulo-ya, ọnyà.

28. Ewe me ka Midian ruru ala n'iru umu Israel, ha ewelighi kwa isi-ha ọzọ. Ala we di jū ọgu arọ abua n'ub͕ochi Gideon.

29. Jerubeal nwa Joash we je biri n'ulo-ya.

30. Gideon nwe-kwa-ra ọgu umu-ndikom atọ na iri ndi siri n'úkwù onwe-ya puta: n'ihi na ọ nwere ọtutu ndinyom.

31. Iko-ya nwayi nke nọ na Shekem, ya onwe-ya mu-kwa-ra ya nwa-nwoke, ọ gua ya aha Abimelek.

32. Gideon nwa Joash we nwua n'ezi isi-awọ, elìe ya n'ílì Joash, bú nna-ya, n'Ọfra nke ndi Abieza.

33. O rue, mb͕e Gideon nwuru, na umu Israel laghachiri, soro Bealim nākwa iko, doro onwe-ha Beal-berit ka ọ buru chi.

34. Ma umu Israel echetaghi Jehova, bú Chineke-ha, Onye nānaputa ha n'aka ndi-iro-ha nile buruburu:

35. ha emeghi kwa ulo Jerubeal, bú Gideon, ebere, dika ezi ihe nile si di nke o mere Israel.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 8