1. Ndikom Efraim we si ya, Gini bu ihe a i meworo ayi, na i kpọghi ayi, mb͕e i jere ibuso Midian agha? Ha we soro ya isesi okwu ike.
2. Ọ we si ha, Gini ka m'meworo ub͕u a dika nke unu mere? Ntutukọ nkpuru ubi-vine fọduru nke Efraim, ọ̀ dighi nma kara ọghughọ-nkpuru-vine nke Abieza?
3. N'aka-unu ka Chineke nyeworo ndi-isi Midian, bú Oreb na Zeeb: ma gini ka m'puru ime dika nke unu mere? Mb͕e ahu obi-ọku-ha juru n'aru ya, mb͕e o kwuru okwu ahu.
4. Gideon we biarue Jọdan igabiga, ya onwe-ya, na ọgu ndikom iri-na-ise ahu ndi soro ya, ha nāda #mbà, ma ha nāchu achu.
5. O we si ndikom Sukot, Biko, nyenu ndi nēsom n'ukwu n'ukwu ob͕e achicha; n'ihi na ha nāda #mbà, ma mu onwem nāchu Zeba na Zalmuna, bú ndi-eze Midian.
6. Ndi-isi Sukot we si, Ọbu-aka Zeba na Zalmuna, hà di n'aka-gi ub͕u a, na ayi gēnye usu-ndi-agha-gi nri?
7. Gideon we si, N'ihi nka mb͕e Jehova gēnye Zeba na Zalmuna n'akam, m'gēwere kwa ogwu nke ọzara were kwa ùgà ticha anu-aru-unu.
8. O si n'ebe ahu rigorue Penuel, gwa ha okwu dika nka: ndikom Penuel we za ya dika ndikom Sukot zara ya.
9. O we gwa kwa ndikom Penuel okwu, si, Mb͕e m'latara n'udo, m'gākwatu ulo-elu a.