Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 8:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Ndikom Efraim we si ya, Gini bu ihe a i meworo ayi, na i kpọghi ayi, mb͕e i jere ibuso Midian agha? Ha we soro ya isesi okwu ike.

2. Ọ we si ha, Gini ka m'meworo ub͕u a dika nke unu mere? Ntutukọ nkpuru ubi-vine fọduru nke Efraim, ọ̀ dighi nma kara ọghughọ-nkpuru-vine nke Abieza?

3. N'aka-unu ka Chineke nyeworo ndi-isi Midian, bú Oreb na Zeeb: ma gini ka m'puru ime dika nke unu mere? Mb͕e ahu obi-ọku-ha juru n'aru ya, mb͕e o kwuru okwu ahu.

4. Gideon we biarue Jọdan igabiga, ya onwe-ya, na ọgu ndikom iri-na-ise ahu ndi soro ya, ha nāda #mbà, ma ha nāchu achu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 8