O we ziga ndi-ozi nime Manase nile; ha onwe-ha kpọkọta-kwa-ra onwe-ha n'azu ya: o we ziga ndi-ozi nime Asha, na nime Zebulun, na nime Naftali; ha we rigo izute ha.