Ma, le, Berak nāchu Sisera, Jael we puta izute ya, si ya, Bia, m'gēme kwa ka i hu nwoke ahu nke gi onwe-gi nācho. O we bakuru ya; ma, le, Sisera adawo nwua, ǹtú ahu di kwa n'akuku egedege-iru-ya.