Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 3:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ndia bu mba ndi Jehova rapuru, iji ha nwa Israel, bú ndi nile nāmaghi agha nile nke Kenean;

2. nání ka ọb͕ọ nile nke umu Israel we mara, izí ha agha, nání ndi nāmaghi ha na mb͕e gara aga;

3. bú ndi-isi ise nke ndi Filistia, na ndi Kenean nile, na ndi Zaidon, na ndi-Haivait ndi bi n'ugwu Lebanon, site n'ugwu Beal-heamon rue nbata Hemat.

4. Ha di kwa ka ewere ha nwa Israel, imara ma ha gānu ihe nile Jehova nyere n'iwu, nke O nyere ndi bu nna-ha n'iwu n'aka Moses.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 3