Umu Benjamin we me otú a, kuru nwunye, dika ọnu-ọgugu-ha si di, site na ndinyom nēte egwū, ndi ha nāpunara ndi Shailo: ha we je lata n'ihe-nketa-ha, wue obodo-ha, biri nime ha.