Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 18:1-13 Bible Nso (IGBOB)

1. Na mb͕e ahu eze adighi n'Israel: na mb͕e ahu ebo ndi Dan nāchọrọ onwe-ha ala-nketa ibiri ebiri; n'ihi na ọ dighi ala bara n'aka-ha n'ihe-nketa n'etiti ebo Israel nile rue ubọchi ahu.

2. Umu Dan we si n'ab͕uru-ha ziga ndikom ise sitere n'ọnu-ọgugu-ha nile, bú ndi-dìnkpà, site na Zọra, site kwa n'Eshtaol, iledo ala ahu, na ileputa ya; ha we si ha, Jenu, leputanu ala ahu: ha we bia ugwu Efraim, rue ulo Maika, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu.

3. Mb͕e ndi ahu nọrọ nso ulo Maika, ha onwe-ha matara olu nwa-okorọbia ahu, bú onye Livai: ha we wezuga onwe-ha ba n'ebe ahu, si ya, Ònye mere ka i bia ebe a? ọ̀ bu kwa gini ka gi onwe-gi nēme n'ebe a? gini ka i nwe-kwa-ra n'ebe a?

4. O we si ha, Otú a na otú a ka Maika meworom, o gowokwam ọlu, m'we ghọrọ ya onye-nchu-àjà.

5. Ha we si ya, Biko, jua Chineke ase, ka ayi we mara ma ije-ayi, bú nke ayi onwe-ayi nēje, gāga nke-ọma.

6. Onye-nchu-àjà ahu we si ha, Jenu n'udo: na ncherita-iru Jehova ka uzọ-unu di, nke unu nēje ije nime ya.

7. Ndikom ise ahu we je, biarue Laish, hu ndi ahu nke bi n'etiti ya, ka ha nēbi na ntukwasi-obi, dika ọme-n'ala ndi Zaidon si di, nādi jū nātukwasi kwa obi; ọ dighi kwa onye nēme ka ihere me ha n'okwu ọ bula n'ala ahu, bú onye nēnweta ike nb͕ochi, n'ebe di ndi Zaidon anya ka ha bi, ọ dighi kwa ihe ha na madu nwekọrọ.

8. Ha we biakute umu-nne-ha rue Zọra na Eshtaol: umu-nne-ha we si ha, Gini ka unu onwe-unu gēkwu?

9. Ha si, Bilie, ka ayi rigo kwa imegide ha: n'ihi na ayi ahuwo ala ahu, ma, le, ọ di nma nke-uku: ùnu onwe-unu nāb͕a kwa nkiti? unu adila ume-ngwu ije na ibà inweta ala ahu.

10. Mb͕e unu biara, unu gābiakute ndi nọ na ntukwasi-obi, ala ahu sara mbara n'aka abua: n'ihi na Chineke enyewo ya n'aka-unu; bú ebe nke ọ nādighi ihe ọ bula nke di n'uwa nakọ n'ebe ahu.

11. Nnù ndikom na ọgu iri ndi ekere ihe-agha, ndi sitere n'ab͕uru ndi Dan, we si n'ebe ahu, bú Zọra na Eshtaol, bulie ije.

12. Ha we rigo, ma ulo-ikwū-ha nime Kiriat-jearim, nime Juda: n'ihi nka ka ha kpọrọ ebe ahu Mahane-dan, rue ta: le, ọ di n'azu Kirian-jearim.

13. Ha we si n'ebe ahu gabiga rue ugwu Efraim, biarue ulo Maika.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 18